Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Moronaị Nwa-nwoke nke Mọmọn


Moronaị Nwa-nwoke nke Mọmọn

Onye-amụma ikpe-azụ ndị Nifaị n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn (ihe dịka afọ 421 mgbe a mụsịrị Kraịst) Obere oge tutu Mọmọn anwụọ, o nyefere otu akụkọ ndekọta nke a kpọrọ epekele nile nke Mọmọn n’aka nwa ya nwoke Moronaị (OkwMọm. 1:1). Moronaị mechara nchịkọta epekele nile nke Mọmọn. O wee tinye isi nile nke 8 na 9 n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn (Mọm. 8:1). O wee dee na nke-nke ma tinye akwụkwọ nke Ita (Ita 1:1–2) na tinye kwa akwụkwọ nke ya nke a kpọrọ akwụkwọ nke Moronaị (Moro. 1:1–4). Moronaị wee rachite epekele nile ahụ na zoo ha n’ugwu Kumora (Mọm. 8:14; Moro. 10:2). N’afọ 1823 Onye-nwe zitere Moronaị dịka Onye biliteworo n’ọnwụ ikpughe Akwụkwọ nke Mọmọn nye Joseph Smith (A—JS 1:30–42, 45; OznỌd. 27:5). O nyere nwa okorọbịa onye amụma ahụ ntụzi-aka kwa afọ site 1823 ruo 1827 (A—JS 1:54) na ikpe-azụ nyefee ya epekele nile ahụ n’afọ 1827 (A—JS 1:59). Mgbe O mechara ntụgharị asụsụ, Joseph Smith nyeghachiri epekele nile ahụ n’aka Moronaị.

Akwụkwọ nke Moronaị

Ngwụcha akwụkwọ dị n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn. Onye amụma nke ikpe-azụ Nifaị Moronaị dere ya. Isi nile nke 1–3 na-akọ maka ngwụcha mbibi nke ndị Nifaị, inye ntụzi-aka banyere nnyefe nke Mụọ Nsọ na ọkwa nchụ-aja ahụ. Isi nile nke 4–5 kọwadaruru ala kpọm-kwem usoro ilekọta oriri-nsọ. Isi nke 6 chikọtara ọrụ nke Nzukọ-nsọ. Isi nile nke 7–8 bụ okwuchukwu nile banyere ụkpụrụ nile nke mbụ nke ozi-ọma, tinyere nkụzi nile sitere n’aka Mọmọn banyere okwukwe, olile-anya na afọ-ọma; na banyere ụzọ e si ekpe ikpe ihe ọma na ihe-ọjọọ (Moro. 7), na Nkọwa nke Mọmọn na Ụmụ-ntakịrị dị ndụ n’ime Kraịst na ha enweghị mkpa maka baptism (Moro. 8). Isi nke 9 na-akọwa nke ọma banyere mmetọ nke mba Nifaị. Isi 10 bụ ozi ikpe-azụ nke Moronaị na tinyekwara ụzọ a ga-esi a mara ezi-okwu nke Akwụkwọ nke Mọmọn (Moro. 10:3–5).