Dọọ-aka-na-ntị, Ịdọ-aka-na-ntị Hụ kwa Nche, Ndị-nche Ịma-ọkwa ma-ọbu ịkpachapụ anya. Ndị amụma, ndị ndu, na ndị nne na nna na-adọ-aka-na-ntị ma na-akụziri ndị ọzọ ka ha na-erube isi nye Onye-nwe na nkụzi ya nile. Jekọb dọrọ ndị Nifaị aka na ntị megide ụdị mmehie nile, Jekọb 3:12. Olu nke Ịdọ-aka-na-ntị na-adara mmadụ nile, OznỌd. 1:4. Mee ka nkwusa ozi-ọma unu bụrụ olu nke ịdọ-aka-na-ntị, OznỌd. 38:41. Nke a bụ ụbọchị nke ịdọ-aka-na-ntị, OznỌd. 63:58. Onye ọbụla a dọworo aka-na-ntị, dọọ kwa onye agbata-obi ya aka-na-ntị, OznỌd. 88:81. Adọwo m unu aka-na-ntị, ma maa ọkwa ịdọ unu aka na ntị, site n’inye unu okwu nke amamihe, OznỌd. 89:4.