Nsọ Hụ kwa Enweghị ntụpọ; Ido-nsọ; Ịdị-nsọ Dị nsọ, na-enwe omume yiri nke Chineke, ma-ọbụ enweghị ntụpọ nke mụọ ma-ọbụ mụọ ime ihe ọma. Azụ okwu nke nsọ bụ ihe-efu ma-ọbụ ihe na-adịghị nsọ. Ụnụ ga-abụkwara m ala-eze nke ndị nchụ-aja, na mba dị nsọ, Ọpụ. 19:5–6 (1 Pita 2:9). Onye-nwe nyere Israel iwu: Unu ga-edo kwa onwe unu nsọ n’ihi na nsọ ka mụ onwe m dị, Lev. 11:44–45. Ndị ahụ ọbụ-aka abụọ ha dị ọcha, na-enweghị ntụpọ na obi ha, ga-eguzosi ike n’ebe nsọ ya, Abụọma 24:3–4. Kuziere ndị m ihe dị iche n’etiti ihe dị nsọ na ihe na-adịghị nsọ, Ezik. 44:23. Chineke ewerewo ọkpụkpọ dị nsọ kpọọ anyị, 2 Tim. 1:8–9. I sitere n’oge ịdị nwanta mata ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ, 2 Tim. 3:15. Ndị nile dị-nsọ nke Chineke kwuru okwu dịka Mụọ Nsọ kwalitere ha, 2 Pita 1:21. Mmadụ nile ka a ga-ekpe ikpe dika ezi-okwu na ịdị-nsọ nke dị n’ime Chineke siri dị, 2 Nif. 2:10. Mmadụ nke ụdị okike aghọwo onye-nsọ site n’aja mgbaghara mmehie nke Kraịst, Mosa. 3:19. Unu jee ije n’usoro ịdị-nsọ nke Chineke siri dị, Alma 7:22 (Alma 13:11–12). A sachara ndị na-eso ụzọ atọ na anụ arụ nke mere na ha dị nsọ, 3 Nif. 28:1–9, 36–39. Ejila ihe nile dị nsọ ka ihe efu, OznỌd. 6:12. Ị gaghị enwe ike ide ihe ahụ nke dị nsọ ma-ọbụghị ma e nyere gị ya site n’aka m, OznỌd. 9:9. Unu ga-ejikọ onwe unu ọnụ ime ihe n’ịdị nsọ nile n’iru m, OznỌd. 43:9. Ndị na-eso ụzọ m nile ga-eguzo n’ebe nsọ nile, OznỌd. 45:32. Nke ahụ sitere n’elu bịa dị nsọ, OznỌd. 63:64. Ụmụ-ntakịrị dị nsọ, OznỌd. 74:7. Doo nụ ebe ahụ nsọ, a ga-eme ya ka ọ dị nsọ, OznỌd. 124:44. Onye-nwe ga-akpọkọta ndị ya o hopụtara n’ime otu nnukwu obodo dị nsọ, Moses 7:62.