Mee enyi Hụ kwa Ịdị n’out; Ịhụ n’anya Maka Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a, ime-enyi gụnyere inye onwe ka onye nso nke enyi, ife ofufe, iwelite elu na ịgba ndị ọzọ ume. Hụ onye agbata-obi gị n’anya dịka onwe gị, Lev. 19:18 (Mat. 19:19; OznỌd. 59:6). Mgbe ị gbanwere, mee kwa ka ụmụ nna gị guzosie ike, Luk 22:32. Unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ, Jọn 13:35. Na-azụ atụrụ m, Jọn 21:15–17. Ha wee rịọ k’anyị wekwasị onwe anyị ime-enyi nke ije-ozị nke ndị nsọ nile, 2 Ndị-Kọ 8:1–5. Nnwekọ anyị bụ nke anyị soro Nna ahụ na Ọkpara ya na-enwekọ, 1 Jọn 1:3. Ndị Nifaị na ndị Leman wee na-emere enyi otu onye na ibe ya, Hil. 6:3. Ka onye ọbụla chee n’ụzọ dị elu maka nwa nne ya nwoke dịka onwe ya, OznỌd. 38:24–25. Ọbụrụ na unu abụghị otu, unu abụghị nke m, OznỌd. 38:27. Anabatara m unu na mmekọrịta ịbụ enyi na nwanne nwoke, OznỌd. 88:133.