Obi tiwara-etiwa Hụ kwa Chegharịa, Nchegharị; Chụọ-aja, Ịchụ-aja; Dị nwayọ, Ịdị nwayọ; Obi; Umeala, Ịdị umeala Inwe obi tiwara etiwa bụ ịdị nwayọ, inwe mụọ nchegharị, inwe nchegharị, na ịdị umeala n’obi-nke bụ inwe nnabata nye uche obi Chineke. Ana m ebinyere onye ahụ nwere mụọ nchegharị na mụọ ịdị nwayọ, Aịsa. 57:15. Kraịst nyere onwe ya n’ihi ndị nile nwere obi etiwara etiwa na mụọ nke nchegharị, 2 Nif. 2:7. Nye Onye-nwe maka ichụ-aja obi tiwara etiwa na mụọ nke nchegharị, 3 Nif. 9:20 (OznỌd. 59:8). Ọ bụ nanị ndị ahụ nwere obi e tiwara etiwa na mụọ nke nchegharị ka a na-anabata ime baptism, Moro. 6:2. A kpọgidere Jisus n’obe n’ihi nsacha nke mmehie nile nye ndị nwere obi nchegharị, OznỌd. 21:9. Onye nwere mụọ nchegharị ka a ga-anabata, OznỌd. 52:15. Mụọ Nsọ ka e kwere nkwa nye ndị na-echegharị, OznỌd. 55:3. Ezipuwo mụọ m ka O nye ndị dị nwayọ na ndị na-echegharị ìhè, OznỌd. 136:33.