Kwalite Mụọ, Nkwalite nke Mụọ Hụ kwa Mkpughe; Mụọ Nsọ Nduzi dị nsọ nke Chineke na-enye mmadụ. Nkwalite nke mụọ na-abia ọtụtụ mgbe site na Mụọ ahụ n’ụzọ dị iche-iche nye uche ma-ọbụ obi nke onye ahụ. Mgbe ọkụ gasịrị olu nta nke dị ezi nwayọọ dara, 1 Ndez. 19:12. Mụọ Nsọ ga-ezi unu ihe, mee kwa ka unu cheta okwu nile, Jọn 14:26. Mụọ nke ezi-okwu ga-eduba unu n’ezi-okwu nile, Jọn 16:13. Mụọ ahụ wee duru m, na-amaghị ihe nile m ga-eme na mbụ, 1 Nif. 4:6. Olu nke Onye-nwe batara n’ime uche m ọzọ, Inọs 1:10. Ihe nile nke na-akpọ oku ma na-eto akpịrị ime ihe ọma bụ nke Chineke kwalitere, Moro. 7:13–16. Ọbụ na m ekwughị udo nye obi gị? OznỌd. 6:23. Aga m agwa gị n’ime uche gị ma n’ime obi gị, OznỌd. 8:2. Mụọ m ga-agba-ama nye echiche gị, nke ga-emeju mkpụrụ obi gị n’on̄u, OznỌd. 11:13. A ga-enye gị n’oge ahụ ihe ị ga-ekwu ma-ọbụ dee, OznỌd. 24:6 (OznỌd. 84:85). Olu ahụ dị nwayọ dị kwa ntakịrị na-ataka ụka gamie ma na-akpọpu ihe nile, OznỌd. 85:6.