Ken Hụ kwa Adam; Ebel; Igbu-mmadụ; Ntụgwa nzuzo nile Otu nwa-nwoke nke Adam na Iv onye gburu nwanne ya nwoke ọ tọrọ Ebel (Jen. 4:1–16). Onye-nwe jụrụ onyinye ya, Jen. 4:3–7 (Moses 5:5–8, 18–26). O gburu nwanne ya nwoke Ebel, Jen. 4:8–14 (Moses 5:32–37). Onye-nwe dobere ọbụbụ-ọnụ na ihe iriba-ama n’arụ ya, Jen. 4:15 (Moses 5:37–41). Adam na Iv nwere ọtụtụ ụmụ ndịkom na ụmụ ndịnyom tutu a mụọ ya, Moses 5:1–3, 16–17. Ọ hụrụ Setan n’anya karịa Chineke, Moses 5:13, 18. Ken na Setan wee banye n’ime ọgbụgba-ndụ na-adịghị nsọ, Moses 5:29–31.