N’ime akwụkwọ-nsọ nile, udo nwere ike ịpụta inwere-onwe site na ọgụ na nnukwu ọgba-aghara ma-ọbụ ịda juu nke ime onwe na nkasi-obi nke a mụrụ site na Mụọ nke Chineke na-enye Ndị-nsọ ya kwesịrị ntụkwasị obi.
Inwere-onwe site n’ọgụ na nnukwu ọgba-aghara
Udo sitere na Chineke nye ndị na-erube-isi
Onye-nzọpụta ka a ga-akpọ Onye-eze nke Udo, Aịsa. 9:6 .
Ọ dịghị udo dịịrị ndị ajọọ mmadụ, Aịsa. 48:22 .
E nwere ìgwè ụsụụ ndị mụọ-ozi nke elu-igwe na-aja Chineke mma na-asị, otuto dịrị Chineke n’ebe kachasị ihe nile elu, udo dị kwa n’elu ụwa, Luk 2:13–14 .
Udo ka m hapụụrụ unu, Jọn 14:27 .
Udo nke Chineke kachasị uche nile, Ndị-Fil. 4:7 .
Ndị nke Benjamịn natara udo nke mụọ, Mosa. 4:3 .
Lee otu ịma mma n’elu ugwu ukwu nile ka ọba ụkwụ nke ndị ahụ na ekwupụta udo, Mosa. 15:14–18 (Aịsa. 52:7 ).
Alma tikuru Onye-nwe mkpu ma chọta udo, Alma 38:8 .
Mụọ nile nke ndị ezi-omume ka a ga-anabata n’ọnọdụ nke udo, Alma 40:12 .
Ọbụ na mụ ekwughị udo nye obi gị gbasara okwu a? OznỌd. 6:23 .
Jee ije n’ịdị nwayọ nke mụọ m, ma ị ga-enwe udo n’ime m, OznỌd. 19:23 .
Onye ahụ nke na-arụ ọrụ nke ezi-omume ga-anata udo, OznỌd. 59:23 .
Jiri ihe nkedo nke afọ ọma yikwasị onwe unu, dịka uwe, nke bụ ihe nkedo nke ozuzu oke na udo, OznỌd. 88:125 .
Nwa m udo dịrị mkpụrụ-obi gị, OznỌd. 121:7 .