Akwụkwọ-ozi nile nke Pọl
Akwụkwọ iri na anọ n’ime Testament Ọhụrụ ndị bụụrụ leta nile Onye-ozị Pọl degaara ndị otu Nzukọ-nsọ. E nwere ike kewasịa ha n’ọgbọ, n’ọgbọ n’ụdị na-eso.
Nke 1 na 2 Ndị Tesalonaịka (afọ 50–51 mgbe a mụsịrị Kraịst)
Pọl dere akwụkwọ-ozi nye Ndị Tesalonaịka site na Kọrịnt n’ime oge njem mgbasa-ozi ya nke abụọ. Ọrụ ya na Tesalonaịka ka a kọwara nke ọma n’ime Ọlndoz. 17. Ọ chọọrọ ịlọghachi na Tesalonaịka mana o nweghị kwa ike ime otụ ahụ (1 Ndị-Tes. 2:18). Ya mere, o ji ziga Timọti ka ọ kwalite mụọ ndị a gbanwere na ka o wetara ya okwu banyere otu ha na-eme. Akwụkwọ-ozi nke mbụ bụ mpụtara sitere n’obi iju n’ekele ya maka nlọta nke Timọti. Akwụkwọ-ozi nke abụọ bụụrụ nke o dere nwa mkpirisi oge n’ikpe-azụ.
Nke 1 na 2 Ndị Kọrịnt, Ndị Galetia, Ndị Roman (Afo 55–57 mgbe a mụsịrị Kraịst)
Pọl dere akwụkwọ-ozi nile nye ndị Kọrịnt n’ime oge njem mgbasa-ozi-ọma ya nke atọ iji zaa ajụjụ nile na imezi-gharị adịghị n’usoro dị n’etiti Ndị-nsọ na Kọrịnt.
Akwụkwọ-ozi e degaara ndị Galetịa nwere ike bụrụ na-edere ya nye ọtụtụ ngalaba Nzukọ-nsọ n’otu n’otu gazuo Galetịa. Ụfọdụ ndị otu Nzukọ-nsọ hapụwara ozi-ọma na nkwado nke iwu ndị Juu. N’ime leta nke a, Pọl kọwara nzube nke iwu nke Moses na uru nke okpukpe-chi nke mụọ.
Pọl dere akwụkwọ-ozi nye ndị Roman site na Kọrịnt, na mpaghara iji kwadobe Ndị-nsọ nke Rom maka nleta nke o nwere olile-anya ileta ha. Leta nke a mesigharịrị ike ozizi nile ndị Juu bụ ndị a gbanwere nye ndị na-eso ụzọ Kraịst na-arụ ụka banyere ha.
Ndị Filipaị, Ndị Kọlọsi, Ndị Efesọs, Faịlimọn, Ndị Hibru (Afọ mgbe a mụsịrị Kraịst 60–62)
Pọl dere akwụkwọ-ozi ndịa mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ nke oge mbụ na Rom.
Pọl dere akwụkwọ-ozi nye ndị Filipaị nke ka nke iji gosi ekele ya na ịhụnanya ya maka Ndị-nsọ Filipaị na igba ha ume n’ọnọdụ olile anya na an̄ụrị site na ngharịpụ nke ogologo oge ọ nọ na mkpọrọ.
Pọl dere akwụkwọ nye ndị Kọlọsi dịka nsonazụ nke mkpesa na Ndị-nsọ Kọlọsi na-adaba n’ime mmehie dị mkpa. Ha kwenyere na itozu-oke bịara site na ịkpachapụ anya dobe emume-nsọ nile nke a na-ahụ anya karịa iwulite ime omume dịka nke Kraịst.
Akwụkwọ-ozi ahụ e degaara ndị Efesọs dị nnukwu mkpa, n’ihi na o nwere nkụzi nile nke Pọl banyere Nzukọ-nsọ nke Kraịst.
Akwụkwọ-ozi e degaara Faịlimọn bụ leta nke onwe gbasara Ọnisimọs, otu onye oru onye nke zuru nna ya ukwu ori bụ Faịlimọn, ma gbafue gbaga Rom. Pọl zighachiri Ọnisimọs azụ nye nna ya ukwu jiri leta ahụ na-arịọ ka ọ gbaghara Ọnisimọs.
Pọl dere akwụkwọ-ozi ahụ e degaara ndị Hibru nye ndị Juu bụ ndị otu Nzukọ-nsọ iji kwagide ha na iwu Moses abụrụwo nke emezuworo na Kraịst na n’iwu nke ozi-ọma Kraịst a nọchiwo ya.
Nke 1 na 2 Timoti, Taitos (Afọ mgbe a mụsịrị Kraịst 64–65)
Pọl dere akwụkwọ-ozi ndị a mgbe a hapụsịrị ya site n’ụlọ mkpọrọ na Rom n’oge nke mbụ.
Pọl jere njem gaa Efesọs, ebe ọ hapụrụ Timọti ka ọ kwụsị ntolite ụdị ụfọdụ nkata dị egwu na-enwe nzube ilọghachi ma emesịa. O dere akwụkwọ-ozi nke mbụ ya o degaara Timọti ikekwe site na Masedonia, iji nye ya ndụmọdụ na igba ya ume na-mmezu ọkwa ọrụ ya.
Pọl dere akwụkwọ-ozi ahụ nye Taịtọs n’oge mgbe o nweere onwe ya site n’ụlọ mkpọrọ. O nwere ike bụrụ na ọ gara leta Krit, ebe Taịtọs naara eje-ozi. Leta ahụ na-ekwu karịa banyere ibi ndụ ezi-omume na ezigbo ọzụzụ n’ime etiti Nzukọ-nsọ.
Pọl dere akwụkwọ-ozi ya nke abụọ nye Timọti mgbe ọ nọ n’ime ụlọ mkpọrọ nke oge abụọ, mkpirisi oge tutu e gbuo ya n’ihi okwukwe ya. Akwụkwọ-ozi a nwere okwu ndị ikpeazụ nke Pọl na-ezi kwa mgbamume dị ịtụnanya na ntụkwasị-obi nke o jiri che ọnwụ iru.