Ozizi nke Kraịst Hụ kwa Atụmatụ nke mgbapụta; Ozi-ọma Ụkpụrụ nile na nkuzi nile nke ozi-ọma Jisus Kraịst. Ozizi m ga-atasa dịka mmiri ozuzo, Deut. 32:2. Ndị na-atamu ga-amụta ozizi, Aịsa. 29:24. Ozizi ya wee tụ ndị mmadụ ahụ n’anya, Mat. 7:28. Ozizi m a bụghị nke m kama-ọbụ nke onye ahụ zitere m, Jọn 7:16. Akwụkwọ-nsọ nile bara uru maka ozizi, 2 Tim. 3:16. Nke a bụ ozizi nke Kraịst, ma bụrụkwa nanị ozizi nke ezi-okwu nke Nna, 2 Nif. 31:21 (2 Nif. 32:6). Agaghị enwe ịrụ ụka n’etiti unu gbasara ọkpụrụkpụ okwu nile nke ozizi m, 3 Nif. 11:28, 32, 35, 39–40. Setan na-akpalite obi nile nke ndị mmadụ na ndọrọ ndọrọ gbasara ọkpụrụkpụ-okwu nile nke ozizi m, OznỌd. 10:62–63, 67. Kuziere nụ ụmụ unu ozizi nke nchegharị, okwukwe n’ime Kraịst, baptism ma onyinye nke Mụọ Nsọ, OznỌd. 68:25. Unu ga-akuzi otu onye nye ibe ya ozizi ahụ nke ala-eze, OznỌd. 88:77–78. Ozizi nke ọkwa nchụ-aja ga-atasa na mkpụrụ obi gị, OznỌd. 121:45.