Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Testament Ochie


Testament Ochie

Edemede nile nke ndị amụma agba ochie, ndị mere omume n’okpuru ike na-arụ ọrụ, n’ime nke Mụọ Nsọ na dị n’ime karịa ọtụtụ nari afọ nile, gbara-ama maka Kraịst na ije-ozị ya nke di n’iru. O nwekwara otu ndekọta nke akụkọ nke Abraham na ụmụ ụmụ ya, jiri Abraham na Ọgbụgba-ndụ ahụ malite, ma-ọbụ ịgba-ama nke Onye-nwe na Abraham mere ya na ụmụ ụmụ ya.

Akwụkwọ ise nke mbụ nke Testament Ochie bụụrụ Moses dere ha. Ha bụ Jenesis, Ọpụpụ, Leviticọs, Ọnụ-ọgụgụ, na Deuteronọmị. Jenesis na-atụnyere mmalite nke ụwa, mmadụ, asụsụ nile, agbụrụ nile, na mmalite nke ụlọ nke Israel.

Akwụkwọ akụkọ nile ahụ na-akọ maka ihe nile mere eme nke Israel. Akwụkwọ nile ndịa bụ Joshua, Ndị-ikpe, Rut, nke 1 na 2 Samuel, nke 1 na 2 Ndị-eze, nke 1 na 2 Ihe mere n’oge ndị-eze, Ezra, Nehemaia, na Esta.

Akwụkwọ abụ nile dekọtara ụfọdụ n’ime amamihe na ihe ọgụgụ nke ndị amụma. Ha bụ Job, Abụ-oma, Ilu, Eklisiastis, Abụ nke Abụ (Abụ nke Solomon), na Abụ-akwa nile.

Ndị amụma dọrọ Israel aka na ntị maka mmehie ya nile na gbaa-ama banyere ngọzi nile na-abịa site na irube-isi. Ha buru amuma banyere ọbịbịa nke Kraịst onye ga-achụ aja mgbaghara mmehie maka mmehie nile nke ndị ahụ ga-echegharị, nata emume-nsọ nile, ma bie ndụ nke ozi-ọma. Akwụkwọ nile nke ndị amụma bụ Aịsaịa, Jeremaịa, Ezikiel, Daniel, Hosea, Joel, Emọs, Obadaịa, Jona, Maịka, Nehum, Habakuk, Zefanaịa, Hagai, Zakaraịa, na Malakaị.

Nke kachasị na akwụkwọ nile nke Testament Ochie ka e dere n’asụsụ Hibru. Edemede nile dị ole na ole nwere Aramaịk, otu asụsụ agbata obi.