Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Livaị


Livaị

N’ime Testament Ochie, nwa-nwoke nke atọ nke Jekọb na Lia (Jen. 29:34; 35:23). Livaị abịa bụrụ nna nke otu n’ime agbụrụ nile nke Israel.

Agbụrụ nke Livaị

Jekọb gọziri Livaị na ụmụ ụmụ ya (Jen. 49:5–7). Ụmụ ụmụ Livaị jere-ozi n’ime ebe mgbaba nile dị nsọ nke Israel (Ọnọgụ. 1:47–54). Erọn bụụrụ onye Livaị, ma ụmụ ụmụ ya bụụrụ ndị nchụ-aja (Ọpụ. 6:16–20; 28:1–4; 29). Ndị Livaị nyeere ndị nchụ-aja aka, ụmụ ndịkom nke Erọn (Ọnọgụ. 3:5–10; 1 Ndez. 8:4). Oge ụfọdụ ha mere omume dịka ndị na-eti egwu (1 Ihem. 15:16; Neh. 11:22); Ha gburu ihe ịchụ-aja nile (2 Ihem. 29:34; Ezra 6:20); na n’ọha, ha nyere aka n’ime temple (Neh. 11:16). E nyefere ndị Livaị n’ọrụ nke Onye-nwe ilekọta emume-nsọ nile maka ụmụ nke Israel. Ndị Livaị n’onwe ha bụ ndị e nyere n’onyinye n’aha ụmụ nke Israel (Ọnọgụ. 8:11–22) ha sitere otua bịa bụrụ ihe onwunwe nke aka Chineke nke e nyere ya na-ọnọdụ onye e bu ụzọ mụọ (Ọnọgụ. 8:16). E doghị ha nsọ ma na a sachara ha n’ihi ọkwa ha (Ọnọgụ. 8:7–16). Ha e nwetaghị nketa nke ala na Kenean (Ọnọgụ. 18:23–24), mana ha natara otu ụzọ n’ime ụzọ iri (Ọnọgụ. 18:21), Nnukwu obodo dị mkpa iri anọ na asatọ (Ọnọgụ. 35:6), na ihe ruru ha nke bụ ịnata onyinye mmepụ-aka nke ndị mmadụ n’oge mmemme nile (Deut. 12:18–19; 14:27–29).