Jerusalem
Otu nnukwu obodo dị na Israel nke ọhụrụ. Ọ bụ nnukwu obodo kachasị ịpụta ìhè n’akụkọ bible. Ụfọdụ n’ime ebe kachasị ịdị nsọ maka Ndị-Otu-Kraịst, ndị Juu, na ndị alakụba dị n’ime nnukwu obodo a na ọtụtụ ndị kwere-ekwe kwesịrị ntụkwasị obi na-eleta ya kwa mgbe. A na-atụnyere ya dịka nnukwu obodo dị nsọ ọtụtụ mgbe.
Ebe a maara mbụ dịka Selem (Jen. 14:18; Abụọma 76:2), Jerusalem bụụrụ nnukwu obodo ndị Jebus ruo mgbe Devid jidere ya n’agha (Josh. 10:1; 15:8; 2 Sam. 5:6–7), onye mere ya isi obodo ya. Ruo mgbe ahụ ọ na-arụ ọrụ karichasịa dịka ebe a rụsiri ike n’ugwu, dịka (mita 800) n’elu oke osimiri. Ndagwurugwu gbara ya gburu gburu n’akụkụ nile ewezuga na mpaghara elu-elu.
N’oge ọchịchị Eze Devid na Jerusalem, o biri n’obi-eze e jiri osisi wuo. Otu o sila dị n’oge ichi eze nke Solomọn, ndị mmadụ ahụ mere ọtụtụ ihe iji chọọ nnukwu obodo ahụ mma tinyere iwu obi-eze na temple ahụ.
Mgbe ala-eze nile nke Israel na Juda kewasịchara, Jerusalem nọdụrụ dịka isi obodo nke Juda. Ọtụtụ mgbe ka usuu ndị-agha-mbakpọ na-ebuso ya agha n’iwe (1 Ndez. 14:25; 2 Ndez. 14:13; 16:5; 18–19; 24:10; 25). N’okpuru Hezekaia, Jerusalem bịara bụrụ etiti okpukpere chi, mana e bibiri mpaghara ya na afọ 320 tutu a mụọ Kraịst, 168 tutu a mụọ Kraịst, na 65 tutu a mụọ Kraịst. Herọd rụgharịrị mgbidi ya nile na temple ahụ, mana n’afọ 70 mgbe a mụsịrị Kraịst, ndị Rom bibiri ya kpam kpam.