Kenean, Onye Kenean
N’oge nile nke Testament Ochie, Kenean bụ nwa-nwoke nke anọ nke Ham (Jen. 9:22; 10:1, 6) na nwa nwa nke Noa. Onye Kenean ka a na-atụnyere Onye si n’ala ahụ ebe Kenean biiri na kwa ụmụ ụmụ ya nile. Ndị Kenean bụ kwa aha ndị biiri na ndịda ala ahụ dị ogologo ofe mmiri Mediterenia nke Palestain. Aha a ka ana-eji akọwa ndị nile na-abụghị ndị Israel bi n’obodo ahụ mpaghara Ọdịda Anyanwụ nke Jọdan, bụ ndị Grik kpọrọ ndị Fonesia.