Jee-ije, Soro Chineke jegharịa Hụ kwa Ezi-omume, Ime ezi-omume; Irube-isi, Nrube-isi, Rube-isi; Ụzọ I nwe nkwekọrịta nye nkụzi nile nke Chineke na ibi ndụ dịka Chineke chọrọ ka ndị ya bie ndụ, inwe nnabata na nrube isi nye mmetụ nile nke Mụọ Nsọ. Ka m wee nwaa ha ma ha ga-eje ije n’iwu m, ma-ọbụ na ha agaghị eje, Ọpụ. 16:4. Agaghị egbochi ezi ihe n’ebe ndị na-ejegharị n’izu-oke nọ, Abụọma 84:11. Ndị na-ejegharị n’ụkpụrụ m nile na dobe emume-nsọ m nile ga-abụ ndị nke m, Ezik. 11:20–21 (Deut. 8:6). Ọbụ gịnị ka Onye-nwe chọrọ gị n’aka ma ọ bụghị na ị ga-eji obi umeala soro Chineke jee ije? Maịka 6:8 (OznỌd. 11:12). Na-ejegharị n’ìhè ahụ dịka Chineke nọ n’ìhè ahụ, 1 Jọn 1:7 (2 Jọn 1:6; 4 Nif. 1:12; 3 Jọn 1:4). Na-eje ije n’ụzọ ahụ dị wara wara nke na-eduba na ndụ, 2 Nif. 33:9. Eze Benjamịn jere ije n’obi ọcha n’iru Chineke, Mosa. 2:27. Ọrụ unu bụ ije ije dịka usoro nsọ nke Chineke siri dị, Alma 7:22. Ndị otu Nzukọ-nsọ ga-egosipụta ije ije na mkparịkọta-ụka n’oyiyi nke Chineke, OznỌd. 20:69. Ị ga-ege ntị n’okwu onye-amụma na jee ije n’ịdị nsọ nile n’iru Onye-nwe, OznỌd. 21:4. Kụziere nụ ụmụ-ntakịrị ikpe ekpere na ije-ije n’iru Onye-nwe, OznỌd. 68:28. Ga-anọgide n’ime m, ma mụ onwe m n’ime unu, ya mere soro m na-ejegharị, Moses 6:34.