Ọrụ nile Omume nile nke mmadụ, ma-ọdị mma ma-ọdị njọ. A ga-ekpe onye ọbụla ikpe site n’ọrụ ya nile. Onye-nwe ga-enyeghachi mmadụ ọbụla dịka ọrụ ya nile siri dị, Ilu 24:12. Mee nụ ka ìhè unu na-enwu n’iru ndị mmadụ, ka ha wee hụ ọrụ ọma nile unu, Mat. 5:16 (3 Nif. 12:16). Onye na-eme ihe Nna m na-achọ ga-aba n’ala-eze elu-igwe, Mat. 7:21. Okwukwe na-enweghị ọrụ nile bụ ihe nwụrụ anwụ, Jemes 2:14–26. A ga-ekperịrị ha ikpe n’ọrụ ha nile, 1 Nif. 15:32 (Mosa. 3:24). Anyị matara n’ọbụ site n’amara ka a zọpụtara anyị, mgbe anyị mesiworo ihe nile anyị nwere ike ime, 2 Nif. 25:23. Kụziere ha ka ike ghara ịgwụ ha na-ịrụ ezi ọrụ nile, Alma 37:34. Ọ dị mkpa na-aga ekpe ndị mmadụ ikpe dịka ọrụ ha nile siri dị, Alma 41:3. Site n’ọrụ ha nile unu ga-amata ha, Moro. 7:5 (OznỌd. 18:38). Mụ bụ onye-nwe ga-ekpe mmadụ nile ikpe dịka orụ ha nile siri dị, OznỌd. 137:9.