Devid
Eze nke Israel mgbe Ochie n’ime Testament Ochie.
Devid bụụrụ otu nwa-nwoke nke Jesi nke agbụrụ Juda. Ọ bụụrụ nwa okorọbịa nwere mgbamume, onye gburu otu ọdụm, otu anụ-ọhịa buru ibu na-eri ibe ya na onye Filistịa ahụ mmadụbuenyi Golaiat (1 Sam. 17). A họọrọ Devid ma tee ya mmanụ ịbụ eze Israel. Dịka Sọl, na ndụ ya n’okenye ọ bụụrụ onye ikpe mara n’ihi ime ihe ọjọọ nile dị egwu, kama na-emeghị ka Sọl, Ọ na-enwe ike ịkwa ezi mmaakwara. Ya mere o jiri nwee ike ichọta mgbaghara, ewezuga na ogbugbụ nke Uraia (OznỌd. 132:39). Enwere ike kewaa ndụ ya mpaghara anọ: (1) Na Betlehem, ebe ọ nọbuuru dịka Onye ọzụzụ-atụrụ (1 Sam. 16–17); (2) Na obi-Eze Sọl (1 Sam. 18–19:18), (3) dịka onye ngagharị n’ihi ịta ahụhụ (1 Sam. 19:18–31:13; 2 Sam. 1:1-27) (4) dịka eze na-achị Juda na Hebrọn (2 Sam. 2–4), ma n’ikpe azụ dịka eze nke Israel nile (2 Sam. 5–24; 1 Ndez. 1:1–2:11).
Mmehie Devid nke ịkwa-iko ya na Batsheba ka ọtụtụ ohere ọjọọ nile sochiri nke mebiri iri afọ abụọ ikpe-azụ nke ndụ ya. Mba ahụ na ọha mere nke ọma n’oge ọchịchị ya, mana Devid tara ahụhụ site n’ihe nile na-eso mmehie ya nile. E nwere esem-okwu di ilu nile na-eme na-esepụghị aka n’ezi na ụlọ, nke na-iji maa atụ banyere Absalọm na Adonaija, o rutere na nnupụ-isi na mbara. Ihe ndị a nile mere bụ mmezu nkwupụta nke Netan onye-amụma mere n’ihi mmehie ya (2 Sam. 12:7–13).
Na-agbanyeghị mbibi ndịa nile, ọchịchị Devid bụụrụ nke na-amuke amuke karichaa n’akụkọ ndị Israel, n’ihi na (1) O jikọrọ agbụrụ nile ahụ n’otu n’ime otu mba. (2) O chedoro ihe onwunwe nile na-adịghị n’irụ-ụka nke ala ahụ (3) Ọ tọrọ nto-ala ọchịchị n’elu ezi okpukpe chi nke na uche-obi Chineke bụ iwu nke Israel. N’ihi uche ndịa nile, ọchịchị Devid na-ikpe-azụ ka e lere anya dịka ọgbọ ọla-edo nke mba ahụ na ụdị ọgbọ na-adị otuto karịa bụ mgbe Mesaia ahụ ga-abia (Aịsa. 16:5; Jer. 23:5; Ezik. 37:24–28).
Ndụ Devid na-enye ọmụma-atụ ọchịchọ maka mmadụ nile ịnogide n’ime ezi-omume ruo n’ọgwụgwụ. Dịka okorọbịa, e kwuru na-ọ bụ otu nwoke dịka obi nke Onye-nwe si chọọ (1 Sam. 13:14), dịka ndịkom, o kwuru site na mụọ na nwee ọtụtụ mkpughe nile. Mana ọ kwụrụ ụgwọ dị arọ maka erubeghị isi ya nye Iwu-nsọ nile nke Chineke (OznỌd. 132:39).