Nnupụ-isi Hụ kwa Ekwensu; Mmehie; Ngọnarị okwukwe; Ntamu Ịgọnarị ma-ọbụ imegide Onye-nwe, tinyere ijụ iso ndị ndu ya nile a họrọ ahọ na ịkpachara anya ghara irubere iwu-nsọ ya nile isi. Unu enupukwala-isi megide Onye-nwe, Ọnọgụ. 14:9. Nanị nnupụ-isi ka onye ọjọọ na-achọ, Ilu 17:11. Ahụhụ ga-adiri ụmụ-ntakịrị na-enupu-isi, Aịsa. 30:1. Onye-nwe adịghị agbapụta otu n’ime ndị na-enupu isi megide ya ma nwụọ n’ime mmehie ha nile, Mosa. 15:26. Ndị Amlịsaị pụtara na nnupụ-isi pụtara ìhè megide Chineke, Alma 3:18–19. Ndị nnupụ-isi ka a ga adupu n’iru-uju dị ukwuu, OznỌd. 1:3. Iwe nke Onye-nwe adịwo ọkụ megide ndị nnupụ-isi, OznỌd. 56:1 (OznỌd. 63:1–6). Setan nupuru-isi megide Chineke, Moses 4:3.