Ebe ịchụ-aja Hụ kwa Chụọ-aja, Ịchụ-aja Ihe e wuru-ewu n’ihi ịchụ-aja nile, Onyinye nile na ofufe. Noa wee wuoro Onye-nwe ebe ịchụ-aja ma chụọ aja nsure ọkụ nile, Jen. 8:20. Abram wuru ebe ịchụ-aja nye Onye-nwe wuru ebe ịchụ-aja nye Onye-nwe, Jen. 12:7–8. Abraham ekee Aịsak nwa ya nwoke agbụ n’elu ebe ịchụ-aja ahụ, Jen. 22:9 (Jen. 22:1–13). Jekọb ewuo ebe ịchụ-aja n’ebe ahụ, ma kpọọ ebe ahụ El-bet-el, Jen. 35:6–7. Elaịja ewuo ebe ịchụ-aja, ma maa ndị nchụ-aja nile nke Beal aka n’iru, 1 Ndez. 18:17–40. Ọbụrụ na ị na-eweta onyinye gị n’ebe ịchụ-aja, buru ụzọ mee ka gị na nwa-nne gị dị n’udo, Mat. 5:23–24. M wee hụ n’okpuru ebe ichụ aja ahụ mkpụrụ obi nile nke ndị e gburu n’ihi okwu Chineke, Mkpu. 6:9 (OznỌd. 135:7). Lihai wee jiri okwute wuo ebe ịchụ-aja, ma nyekwa Onye-nwe ekele, 1 Nif. 2:7. A zọpụtara Abraham site n’ọnwụ n’elu ebe ịchụ-aja nke Elkena, Abr. 1:8–20.