Epekele nchekwa obi nile
Akwụkwọ-nsọ nile na-akpọtụ ọnụ ụdị epekele nchekwa obi abụọ: (1) Mpaghara iru nke uwe mgbochi onye agha, ma-ọbụ ihe agha. N’ọnọdụ akara ihe àtụ̀, Ndị-nsọ nile kwesịrị iyikwasị epekele mkpuchi obi nke ezi-omume, iji gbochiere onwe ha mmegide ihe ọjọọ (Aịsa. 59:17; Ndị-Efe. 6:14). (2) Ihe uwe onye isi nchụ-aja na-eyi n’iwu Moses (Ọpụ. 28:13–30; 39:8–21). E jiri akwa ọcha dị fere fere (Linin) mee ya, ọ bụkwa nkume oke ọnụ ahia iri na abụọ dị n’ime ya. Oge ụfọdụ a na-atunyere ya inwe mmekọrịta ya na Urim na Tumim (OznỌd. 17:1; A—JS 1:35, 42, 52).