Ọmiko Hụ kwa Afọ-ọma; Ebere, Obi-ebere; Ịhụ n’anya N’ime akwụkwọ-nsọ nile, ọmiko n’uche na-emigh-emi pụtara iso taa ahụhụ. Ọ pụtakwara igosi ahizu, mwute, na ebere maka onye-ọzọ. Onye-nwe wee kpọkuo ndị ya ka ha na-egosi ọmiko, Zek. 7:8–10. Jisus nwere ọmiko n’arụ ha, Mat. 9:36 (Mat. 20:34; Mak 1:41; Luk 7:13). Otu onye Sameria wee nwee ọmiko n’arụ otu onye na ibe ya, Luk 10:33. Nwerita nụ omiko onye na arụ ibe ya, 1 Pita 3:8. Kraịst jupụtara n’ọmiko n’ebe ụmụ mmadụ nọ, Mosa. 15:9. Afọ m nile jupụtara n’ọmiko n’ebe unu nọ, 3 Nif. 17:6. Joseph Smith wee rịọ maka ọmiko nke Onye-nwe, OznỌd. 121:3–5.