Maịkel Hụ kwa Adam; Onye-isi mụọ-ozi Aha ahụ nke e jiri mara Adam na ndụ tutu e nwee anụ arụ. A na-akpọ ya Onye-isi Mụọ-ozi ahụ. Na Hibru aha ahụ pụtara “Onye dị ka Chineke.” Maịkel ọtu n’ime ndi-isi ndị ọkpara-eze, wee bịa inyere Daniel aka, Dan. 10:13, 21 (OznỌd. 78:16). N’ụbọchị ndị ikpe-azụ ka Maịkael ga-egụzo ọtọ, bụ nnukwu ọkpara-eze ahụ, Dan. 12:1. Maịkel onye-isi mụọ-ozi, ya na ekwensu rụrịtara ụka, Jud 1:9. Maịkel na ndị mụọ-ozi ya buru agha megide dragon ahụ, Mkpu. 12:7 (Dan. 7). Maịkel bụ Adam, OznỌd. 27:11 (OznỌd. 107:53–57; 128:21). Maịkel, onye-isi mụọ-ozi nke Onye-nwe ga-afụ opi-ike ya, OznỌd. 29:26. Maịkel ga-akpọkọta ndị agha nile nke ya ma lụọ agha megide Setan, OznỌd. 88:112–115. Olu nke Maịkel ka a nụrụ mgbe ọ na-achọpụta ekwensu, OznỌd. 128:20.