Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Lot


Lot

N’ime Testament Ochie, nwa-nwoke nke Heran na nwa nwanne nke Abraham (Jen. 11:27, 31; Abr. 2:4). Heran nwụrụ n’ihi ụnwụ n’ime Ua (Abr. 2:1). Lọt hapụrụ Ua ya na Abraham na Sera na soro ha jee Kenean (Jen. 12:4–5). Lọt họọrọ ibi na Sodom. Onye-nwe zigara ndị oje-ozi ka ha gbaara Lọt ama ka ọ gbapụ site na Sodom tutu Onye-nwe ebibie ya n’ihi ajọọ-omume nke ndị ahụ (Jen. 13:8–13; 19:1, 13, 15); Otu o sila dị, nwunye Lọt lere-anya n’azụ na mbibi ahụ ma ghọọ ogidi-nnu (Jen. 19:26). Testament Ọhụrụ nwere ntụnyere nile nye Lọt (Luk 17:29; 2 Pita 2:6–7). Ndụ ya mgbe nkewa ya na Abraham gasịrị ka a kọwara nke ọma n’ime Jenesis 13, 14 na 19.