N’ime akwụkwọ-nsọ nile e nwere ike iji ogbenye tụnyere (1) ndị na-enweghị ihe ndị a chọrọ dị mkpa, dịka ihe oriri, uwe, na ebe mkpuchi, ma-ọbụ (2) ndị ahụ dị umeala na-enweghị mpako.
Ogbenye n’ihe onwunwe a na-ahụ anya
Akwụ-kwụbala aka gị n’ebe nwanne gị bụ ogbenye nọ, Deut. 15:7 .
Onye ajọọ mmadụ site na mpako ya na-akpagbu onye ogbenye, Abụọma 10:2 .
Onye na-enye ogbenye ihe, ihe adịghị akọ ya, Ilu 28:27 .
Weta ndị ogbenye n’ụlọ gị, Aịsa. 58:6–7 .
N’ihi na ha bụ ọgaranya, ha na-eleda ndị ogbenye anya, 2 Nif. 9:30 .
Iji dote mgbaghara nke mmehie unu nile, unu na-ekesa ihe unu nwere nye ndị ogbenye, Mosa. 4:26 .
Ha kesara ihe ha nwere nye ndị ogbenye, Alma 1:27 .
Ọbụrụ na unu achụpụ ndị nọ na mkpa, ekpere unu bụ nke efu, Alma 34:28 .
Ndị Nifaị nwekọtara ihe nile ọnụ; e nweghị ndị ọgaranya na ndị ogbenye, 4 Nif. 1:3 .
Ngọzi na-adịrị karịa nye ndị nwere obi umeala na-abụghị na-amanyere ha amanye n’ihi ịda ogbenye ha, Alma 32:4–6, 12–16 .
Ngọzi na-adịrị ndị dara ogbenye n’ime mụọ ndị na-abịakwute m, 3 Nif. 12:3 (Mat. 5:3 ).