Onye o ruuru iketa oke ihe a na-ahụ anya ma-ọbụ onyinye nile nke mụọ. N’ime akwụkwọ-nso nile, ndị ezi-omume ka e kwere nkwa na ha ga-abụ ndị nketa-oke nke ihe nile Chineke nwere.
Abraham wee bụrụ onye nketa nke ụwa site n’ezi-omume nke okwukwe, Ndị-Rom 4:13 .
Anyị bụ ụmụ nke Chineke, ma ọbụrụ na anyị bụ ụmụ, anyị bụ ndị nketa oke nke Chineke na ndị ha na Kraịst na-ekekọ, Ndị-Rom 8:16–17 (OznỌd. 84:38 ).
Ị bụ nwa-nwoke na onye nketa site na Kraịst, Ndị-Gal. 4:7 .
Chineke enyewo Ọkpara ya ọkwa ịbụ onye-nketa nke ihe nile, Ndị-Hib. 1:2 .
Ndị lekwasịworo anya na nsachapụ nke mmehie ha nile, ga-abụ ndị nketa nke ala-eze nke Chineke, Mosa. 15:11 .
Ndị mmadụ ahụ a bụrụ ụmụ nke Kraịst na ndị nketa nke ala-eze nke Chineke, 4 Nif. 1:17 .
Ndị ahụ nwụworo na-amaghị maka ozi-ọma ahụ nwere ike bụrụ ndị nketa oke nke ala-eze Selestịal, OznỌd. 137:7–8 .
Ndị nwụrụ anwụ nke chegharịrị ga-abụ ndị nketa-oke nke nzọpụta, OznỌd. 138:59 .