Agha n’ime Elu-igwe Hụ kwa Kansụl n’Elu-igwe; Ndụ tutu e nwee anụ arụ Ndọrọ-ndọrọ ahụ nke mere n’ime ndụ tutu e nwee anụ arụ n’etiti ụmụ Chineke na mụọ. Setan ka a chụpụrụ site n’elu-igwe ma chụda ya n’elu ụwa, Mkpu. 12:4, 7–9. Ekwensu na otu ụzọ n’ụzọ atọ nke elu-igwe ka a chụdara, OznỌd. 29:36–37. Lusifa nupụrụ isi megide Ọkpara nke a Mụrụ Nanị Ya, OznỌd. 76:25–26. Setan chọrọ ebube nke Nna ahụ na ka o bibie ohere-ịhọrọ nke mmadụ, Moses 4:1–4 (Aịsa. 14:12–15; Abr. 3:27–28). Ndị ahụ bụ ndị sooro Chineke ndị debere ohere ịdị ndụ nke mbụ ha, bịara n’ụwa, na natakwara arụ nile, Abr. 3:26.