Ịkwụ-ọtọ, Kwụ-ọtọ Hụ kwa Izu-oke Ịbụ ezie, iju n’ezi-okwu, na enweghi nduhie. Ndị na-eji ezi-okwu eme ihe bụ ndị ihe ha na-atọ Onye-nwe ụtọ, Ilu 12:22. Kwụghachi nke ahụ i na-ekwe na nkwa, Ekl. 5:4–5. Anyị ajụwo ihe nzuzo nile nke ihe na-akwụghị ọtọ, 2 Ndị-Kọ 4:1–2. Na-enwenụ mkparịta ụka unu na-ikwụ ọtọ, 1 Pita 2:12. Ahụhụ na-adịrị onye okwu ụgha n’ihi na o ga-atụda ya n’ala-mụọ, 2 Nif. 9:34. Mụọ ahụ na-ekwu ezi-okwu ma ọ dịghị ekwu okwu-ụgha, Jekọb 4:13. Onye ọbụla na-agbaziri ihe site n’aka onye agbata-obi ya, ga-eweghachi ihe ahụ nke ọ gbaziiri, Mosa. 4:28 (OznỌd. 136:25). Hụ na I na-emeso n’ụzọ ziri-ezi, kpee ikpe ziri-ezi, ma mee ezi omume, Alma 41:14. Ka onye ọbụla bụrụ onye na-eme ihe na-ikwụwa aka ọtọ, OznỌd. 51:9. Ndị nile maara na obi ha ziri-ezi, anabatara m ha, OznỌd. 97:8. Ndị nwoke, na-akwụwa aka ọtọ, maara ihe, na ndị ezi-omume kwesịrị ka akwado ha ịchị-ọchịchị nke ụwa, OznỌd. 98:4–10. Ọbụrụ na ịchọta nke ahụ funarịrị onye agbata-obi gị, Ị ga-eme mgbalị chọọ ya inyeghachi ya ihe ahụ ọzọ, OznỌd. 136:26. Anyị kwere n’ịkwu ọtọ, Ndep. Ok 1:13.