Nnukwu-ugwu Hụ kwa Nsọpụrụ; Were n’ụzọ dị elu maka Dịka e jiri ya n’ime akwụkwọ-nsọ nile, i gosi nkwanye-ugwu na i gosi nsọpụrụ nye onye ọbụla ma-ọbụ ihe ọbụla. Nye nne gị na nna gị nnukwu-ugwu, Ọpụ. 20:12 (1 Nif. 17:55; Mosa. 13:20). Nye Onye-nwe nnukwu-ugwu site n’ihe onwunwe gị, Ilu 3:9. Ọbụrụ na onye ọbụla na-ejere m ozi, ya ka Nna m ga-asọpụrụ, Jọn 12:26. Ndị bụ di kwesịrị inye ndị nwunye ha nnukwu ugwu, 1 Pita 3:7. Site n’egbugbere-ọnụ ha ka ha na-asọpụrụ Onye-nwe, 2 Nif. 27:25 (Aịsa. 29:13). Anaghị m achọ nkwanye ugwu nke ụwa, Alma 60:36. Ekwensu nupuru isi megide m, si; Nye m nnukwu ugwu gị nke bụ ike m, OznỌd. 29:36. Ndị kwesịrị ntụukwasi-obị ka a ga-ekpube nnukwu ugwu, OznỌd. 75:5 (OznỌd. 124:55). Onye-nwe na-enwe mmasị ikwanyere ndị na-efe ya ofufe ugwu, OznỌd. 76:5. A họọrọghị ha n’ihi na ha na-achọ nnukwu ugwu nile nke mmadụ, OznỌd. 121:34–35. Anyị kwere n’irube isi na ịkwdo iwu, Ndep. Ok 1:12 (OznỌd. 134:6).