Nke kachasị elu n’ime ogo ebube atọ nile nke mmadụ ga-etoru ma ndụ nke a gasịa. N’ebe a ndị ezi-omume ga-ebi n’iru Chineke Nna na Ọkpara ya Jisus Kraịst.
Ebube nke Selestịal ka e gosiri n’ọhụ, OznỌd. 76:50–70 .
Ọbụrụ na ndị-nsọ nile enwee agụụ inwe ọnọdụ n’ụwa Selestịal, ha garịrị-ejikere, OznỌd. 78:7 .
Onye ahụ nke na-enweghị ike idebe iwu nke ala-eze Selestịal, enweghị ike idebe ebube Selestịal, OznỌd. 88:15–22 .
N’ebube nke Selestịal e nwere elu-igwe ato, ọnọdụ nile nke eji etoru nke kachasị elu ka e zipụtara, OznỌd. 131:1–2 .
Ụmụ-ntakịrị na ndị na-anwụ tutu ha e ruo afọ nkọwasị ka a na-azọpụta n’ime ala-eze Selestịal, OznỌd. 137:10 .