Hilaman, Nwa-nwoke nke Alma Hụ kwa Alma, Nwa-nwoke nke Alma; Ndị Antai-Nifaị-Lihaị; Ụmụ ndịkom nke Hilaman N’ime Akwụkwọ nke Mọmọn, nwa-nwoke nke Alma kachasị okenye, nwa-nwoke nke Alma (Alma 31:7). Hilaman bụbuuru onye-amụma na onye ndu ndị agha. Alma nyefere n’aka nke Hilaman nwa ya nwoke na ntụkwasị-obi, akụkọ ndekọta nile nke ndị ya, na kwa epekele nile nke ndị Jared, Alma 37:1–2, 21. Alma nyere Hilaman iwu ka ọ gaa-n’iru na-ide akụkọ nke ndị ya, Alma 45–62. Hilaman wee hiwe Nzukọ ahụ ọzọ, Alma 45:22–23. Ụmụ okoro-ọbịa dị puku abụọ bụ ndị agha chọrọ ka Hilaman bụrụ onye-ndu ha, Alma 53:19, 22. Hilaman na ndị ụmụ okorọbịa ya ndị Amọn wee lụso ndị Leman ọgụ ma e chekwara ha site n’okwukwe, Alma 57:19–27.