Nna n’anwụ anwụ Hụ kwa Ezi-na-ụlọ; Ndị Nne na Nna; Ngọzi nile nke onye-isi ezi-na-ụlọ; Nke onye-isi ezi-na-ụlọ, Onye-isi ezi na Ụlọ Akara dị nsọ a na-atụnyere onye nwoke bụ onye na-amụtawori ma-ọbụ kpọrọ nwatakịrị n’ụzọ iwu kwadoro mee ya ka ọ bụrụ otu onye n’ezi na ụlo. Nye nna gị na nne gị nnukwu ugwu, Ọpụ. 20:12 (Deut. 5:16; Mat. 19:19; Mosa. 13:20). Nna na-abara nwa ya mba nke ihe ya na-atọ ya ụtọ, Ilu 3:12. Ndị bụ nna, akpasukwala nụ ụmụ unu iwe, Ndị-Efe. 6:1–4. A kuziere m ihe n’ụdị mmụta nke nna m, 1 Nif. 1:1. Nna m bụụrụ nwoke ziri-ezi, n’ihi na ọ kuziiri m, Inọs 1:1. Alma wee kpee ekpere n’ihi nwa ya nwoke, Mosa. 27:14. Alma wee nye ụmụ ya ndịkom iwu nsọ nile, Alma 36–42. Hilaman nyere ụmụ ya ndịkom aha ndị nne na nna ha mbụ, Hil. 5:5–12. Mọmọn na-echeta nwa ya nwoke n’ekpere ya nile oge nile, Moro. 8:2–3. Ka nnukwu ihe nile bụrụ ihe a chọrọ n’aka ndị nna ha, OznỌd. 29:48. Nwoke ọbụla kwesịrị ịkpata ihe maka ezi na ụlọ nke ya, OznỌd. 75:28. O nyere iwu ka m gakwuru nna m, A—JS 1:49.