Nrọ Hụ kwa Mkpughe Otu ụzọ nke Chineke na-esi ekpughe uche ya nye ndịkom na ndịnyom n’elu ụwa. Otu o sila dị, nrọ nile abụghị mkpughe nile. Nrọ nile nwere nkwalite nke mụọ bu mkpụrụ nke okwukwe. Ọ rọrọ nrọ ma lee ububu na-eguzoro ruo n’ebe elu-igwe dị, Jen. 28:12. Josef wee rọọ nrọ, Jen. 37:5. Onye-nwe ga-agwa ya okwu na nrọ, Ọnọgụ. 12:6. Nebukadneza rọrọ nrọ di iche iche, Dan. 2:1–3. Ndị okenye unu ga-arọ nrọ, Joel 2:28 (Ọlndoz. 2:17). Mụọ-ozi nke Onye nwe egosi ya onwe ya n’ime nrọ, Mat. 1:20 (Mat. 2:19). Lihaị edewo ọtụtụ ihe ndị ọ hụrụ na nrọ, 1 Nif. 1:16. Lihaị rọrọ nrọ, 1 Nif. 8.