Ogboro nkekọ Hụ kwa Onye n’eso ụzọ Ihe a rụpụtara a na-etinye gburu gburu olu nile nke anụmanụ ma-ọbụ ndị mmadụ iji kekọọ ha n’otu. Ogboro nkekọ nke Kraịst bụ otu akara maka iso-ụzọ, ebe ogboro nkekọ nke ịbụ-oru bụ otu akara maka ọchịchị-aka-ike. Ogboro nkekọ m a dịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe, Mat. 11:29–30. Unu na ndị na-ekweghị-ekwe ekekọtala onwe unu, 2 Ndị-Kọ 6:14. Unu ekwela ka e were ogboro nkekọ nke ịbụ-oru tụhịa unu ọzọ, Ndị-Gal. 5:1. Ọ bụghị n’anyị chọrọ iweta onye ọbụla n’ogboro nkekọ nke ịbụ-oru, Alma 44:2. Ntaram ahụhụ nile nke Ndị-nsọ bụ ogboro nkekọ igwe, ụdọ siri ike, na ụdọ-igwe nile nke ala-mụọ, OznỌd. 123:1–3, 7–8.