Erọn, Nwanne nwoke nke Moses Hụ kwa Moses; Ọkwa nchụ-aja nke Erọn N’ime Testament Ochie, otu nwa-nwoke nke Amram na Jokebed nke agbụrụ Livaị (Ọpụ. 6:16–20); nwanne-nwoke nke Moses okenye (Ọpụ. 7:7). Onye-nwe nyere ya ọkwa inyere Moses aka ịkpọpụta ụmụ Israel site n’ime Ijipt na ịbụ onye na-ekwuta ọnụ ya, Ọpụ. 4:10–16, 27–31; 5:1–12:51. N’elu Ugwu Sainai Moses nwetara ntụzi-aka nile banyere Ọkwa Nchụ-aja ahụ e nyere Erọn na ụmụ ya ndịkom anọ, Ọpụ. 28:1–4. O mere nwa-ehi ọla-edo awụrụ awụ na-arịrịọ ndị mmadụ ahụ, Ọpụ. 32:1–6, 21, 24, 35. Ọ nwụrụ n’elu Ugwu Hoa mgbe ọ dị afọ 123, Ọnọgụ. 20:22–29 (Ọnọgụ. 33:38–39). Onye-nwe wee mesiekwa ọkwa nchụ-aja ike n’elu isi Erọn na mkpụrụ ya, OznỌd. 84:18, 26–27, 30. Ndị na-ebuli ọkpụkpọ oku nke ọkwa nchụ-aja nile elu na-abụrụ ụmụ nke Moses na nke Erọn, OznỌd. 84:33–34. Onye-nwe ga-eme ka omume ọma nile nke ndị Nna ahụ kpọrọ dịka ọ kpọkwara Erọn zie-ezi, OznỌd. 132:59.