Ezi-okwu Hụ kwa Akọ n’uche, Akọ n’uche nile; Ìhè, Ìhè nke Kraịst; Mmata-ihe Mmata ihe nke ihe nile dịka ha dị, na dịka ha dịbuuru na dịka ha ga-adị abịa (OznỌd. 93:24.) Ezi-okwu na atụnyekwara ìhè na mkpughe sitere n’elu-igwe. Ezi-okwu ga-esi n’ala puo, Abụọma 85:11 (Moses 7:62). Unu ga-amara ezi-okwu; ezi-okwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’oru, Jọn 8:32. Mụ onwe m bụ ụzọ na ezi-okwu na ndụ, Jọn 14:6. Ọ bụrụ na anyị asi n’anyị enweghị mmehie, ezi-okwu adịghịkwa n’ime anyị, 1 Jọn 1:8. Ndị ikpe mara na-ewere ezi-okwu ahụ ka ihe siri ike, 1 Nif. 16:2. Ndị ezi-omume hụrụ ezi-okwu n’anya, 2 Nif. 9:40. Mụọ ahụ na-ekwu ezi-okwu ma ọ dịghị ekwu okwu ụgha, Jekọb 4:13. Gị onwe gị bụ Chineke nke ezi-okwu ma ị nweghị ike ikwu okwu ụgha, Ita 3:12. Site n’ike nke Mụọ Nsọ unu ga-enwe ike mata ezi-okwu nke ihe nile, Moro. 10:5. Ezi-okwu na-adigide ruo mgbe nile na mgbe nile, OznỌd. 1:39. Mụọ nke ezi-okwu emewo ka ị mara, OznỌd. 6:15. Akwụkwọ nke Mọmọn nwere ezi-okwu ahụ na okwu nke Chineke, OznỌd. 19:26. Onye nkasi obi ka e zipụtara ịkụzi ezi-okwu ahụ, OznỌd. 50:14. Onye na-anata okwu ahụ site na Mụọ nke ezi-okwu na-anata ya dịka a na-ekwusa ya site na Mụọ nke ezi-okwu, OznỌd. 50:17–22. Maa ọkwa ezi-okwu ahụ dịka mkpughe nile nke m nyeworo unu, OznỌd. 75:3–4. Ihe ọbụla bụ ezi-okwu bụ ìhè, OznỌd. 84:45. Ìhè nke Kraịst, bụ ìhè nke ezi-okwu, OznỌd. 88:6–7, 40. Mụọ m bụ ezi-okwu, OznỌd. 88:66. Akọ nuche ma-ọbụ ìhè nke ezi-okwu abụghị ihe e kere eke, OznỌd. 93:29. Ebube ahụ nke Chineke bụ akọn’uche, ma-ọbụ ìhè na ezi-okwu, OznỌd. 93:36. Enyewo m unu iwu ka unu zụlite ụmụ unu na ìhè na ezi-okwu, OznỌd. 93:40. Ọkpara m Mụrụ Nanị ya na jupụtara n’amara na ezi-okwu, Moses 1:6.