Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ Hụ kwa Mkpughe; Onye-isi Nduzi; Ọtụghe-ụzọ nile nke ọkwa nchụ-aja Onye-isi nduzi nke Nzukọ-nsọ na ndị ndụmọdụ ya nile. Ha bụ ọnụ-ọgụgụ juru aka nke ndị isi nchụ-aja atọ na na-anọ n’isi oche n’elu Nzukọ-nsọ nile. Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ na-eji ọtụghe-ụzọ nile nke ọkwa nchụ-aja. Ọtụghe-ụzọ nile nke ala-eze ahụ bụ nke ndị Otu Ndị-isi Nduzi nke Ọkwa nchụ-aja dị Elu mgbe nile, OznỌd. 81:2. Otu Ndị-isi Nduzi nke ọkwa nchụ-aja di elu nwere ike iduzi n’ọkwa ọrụ nile, OznỌd. 107:9, 22. Onye ọbụla nabatara m, nabatara ndị Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ, OznỌd. 112:20, 30. Otu Ndị-isi Nduzi Mbụ ga-anata mkpughe maka Nzukọ-nsọ nile, OznỌd. 124:126.