Izu-ike Hụ kwa Udo; Ụbọchị izu-ike Ikpori-ndụ nke udo na mnwere-onwe site na ịta ikikere eze na nnukwu ọgba-aghara. Onye-nwe ekwewo ndị nsiso ya kwesịrị ntụkwasị-obi nkwa ụdị izu-ike ahụ n’ime ndụ nke a. Ọ kwadowo kwara ha ebe izu-ike n’ime ndụ nke ọzọ na-abịa. Iru m ga-eso gị eje, m ga-enye kwa gị izu-ike, Ọpụ. 33:14. Bịakwute nụ m, unu ndị e bokwara ibu dị arọ, m ga-enyekwa unu izu-ike, Mat. 11:28–29. Anyị rụsịrị ọrụ ike ka ha wee baa n’ime izu-ike ya, Jekọb 1:7 (Ndị-Hib. 4:1–11). Onye ọbụla chegharịrị ga-aba n’ime izu-ike m, Alma 12:34. Ha dị nnukwu ọtụtụ karịrị akarị, ndị e mere ka ha ghara inwe ntụpọ, ma wee baa n’ime izu-ike nke Onye-nwe, Alma 13:12–16. Paradaịs bụ ọnọdụ nke izu-ike, Alma 40:12 (Alma 60:13). Ọdịghị ihe ga-aba n’ime izu-ike ya ma ọbụghị ndị ahụ sachaworo uwe ha nile n’ime ọbara m, 3 Nif. 27:19. Kwupụta nchegharị nye ndị nke a, ka i nwee ike izu-ike gị na ha n’ala-eze nke Nna m, OznỌd. 15:6 (OznỌd. 16:6). Ndị ahụ nke nwụrụ ga-ezu-ike site n’ọrụ ha nile, OznỌd. 59:2 (Mkpu. 14:13). Izu-ike nke Onye-nwe bụ uju nke ebube ya, OznỌd. 84:24.