Ire nile, Onyinye nke Hụ kwa Ire; Onyinye nile nke Mụọ Otu onyinye nke Mụọ Nsọ nke na-ekwenye ndị nile inwe nkwalite nke mụọ ịsụ asụsụ na, ghọta, ma-ọbụ sụgharịa asụsụ nile ha na-amaghị. Anyị kweere n’onyinye nke ire nile (Ndep. Ok 1:7). Ha nile wee jupụta na Mụọ Nsọ, ma wee malite ikwu okwu n’asụsụ dị iche, Ọlndoz. 2:4. Onye na-ekwu okwu n’ire na-amaghị ama, a dịghị agwa mmadụ okwu, kama ọ na-agwa Chineke, 1 Ndị-Kọ 14:1–5, 27–28. Ire nile bụ ihe iriba-ama, ọ bụghị nye ndị kwere-ekwe, kama nye ndị na-ekweghị ekwe, 1 Ndị-Kọ 14:22–28. Mgbe ahụ ka baptism nke ọkụ na nke Mụọ Nsọ ga-abia; na mgbe ahụ ka unu ga-enwe ike ikwu okwu n’ire ndị mụọ-ozi, 2 Nif. 31:13–14. Amalakaị gbara ndị mmadụ ume ka ha kwere n’onyinye nke ikwu okwu n’asụsụ dị iche iche, Ọmnaị 1:25. E nyere ụfọdụ ịsụ asụsụ dị iche iche; ma nye onye ọzọ ịsụgharị asụsụ dị iche iche, OznỌd. 46:24–25 (1 Ndị-Kọ 12:10; Moro. 10:8, 15–16). Ka onyinye nke asụsụ dị iche iche bụrụ ihe a wụpụtara, OznỌd. 109:36.