Ndụ ahụ tutu ndụ nke ụwa. Ndị nwoke nile na ndị nwanyị bibuuru ha na Chineke dịka ụmụ ya na mụọ tutu bịawa n’ụwa dịka ndị na-anwụ anwụ. Oge ụfọdụ a na-akpọ nke a ebe obibi nke mbụ (Abr. 3:26 ).
Mgbe Chineke tọrọ ntọ-ala nke ụwa, ụmụ ndịkom nile nke Chineke wee tisie mkpu on̄u ike, Job 38:4–7 .
Mụọ ahụ ga-alaghachikwuru kwa Chineke onye nyere ya, Ekl. 12:7 .
Tutu a kpụọ m gị n’ime afọ amaara m gị, Jer. 1:4–5 .
Anyị nile bụ ụmụ ndị ọ mụrụ, Ọlndoz. 17:28 .
Chineke họpụtara anyị tutu a tọọ ntọ-ala nke ụwa, Ndị-Efe. 1:3–4 .
Anyị ga-edo onwe anyị karịa n’okpuru Nna nke mụọ nile, Ndị-Hib. 12:9 .
Ndị mụọ-ozi ndị na-edebeghị ebe obibi nke mbụ ha, o debewo ha n’agbụ ụdọ-igwe mgbe n’ile na-adịgide, Jud 1:6 (Abr. 3:26 ).
A chụdara ekwensu na ndị mụọ-ozi ya, Mkpu. 12:9 .
Ihe nile ka e kereworo na mụọ tutu ha adịrị n’ụdị okike ya n’elu ụwa, Moses 3:5 .
M mere ụwa, na mmadụ tutu ha adịrị n’anụ arụ, Moses 6:51 .
Abraham wee hụ akọn’uche ahụ nile a haziworo tutu ụwa adịrị, Abr. 3:21–24 .