Igbu mmadụ na-enweghi nkwado nke iwu na ikpachapụrụ anya. Igbu mmadụ bụ mmehie Chineke mara ikpe siterị na mmalite oge nile (Jen. 4:1–12 ; Moses 5:18–41 ).
Jisus wee si, Egbula mmadụ, Mat. 19:18 .
Ndị ogbu-mmadụ ga-enwe oke ha n’ime ọnwụ nke ugboro abụọ ahụ, Mkpu. 21:8 .
Unu bụ ndị ogbu mmadụ n’ime obi unu, 1 Nif. 17:44 .
Ahụhụ na-adịrị onye ogbu mmadụ nke na-akpachapụ anya na-egbu, 2 Nif. 9:35 .
Chineke enyewo iwu na ndị mmadụ agaghị egbụ mmadụ, 2 Nif. 26:32 .
Igbu mmadụ bụ ihe arụ n’anya nke Onye-nwe, Alma 39:5–6 .
Onye gburu mmadụ agaghị enwe mgbaghara, OznỌd. 42:18 .
Onye ọbụla nke gburu mmadụ, a ga-enyefe ya n’iwu nile nke ala, OznỌd. 42:79 .