Ọchịchị Hụ kwa Iwu nke obodo ọha kwadoro Mgbe Jisus lọghachiri, o ga-ehiwe ọchịchị nke ezi-omume. Ọchịchị ga-adị n’elu ubu ya, Aịsa. 9:6 (2 Nif. 19:6). Nye Sisa ihe nile bụ nke Sisa, Mat. 22:21 (OznỌd. 63:26). Nọdụ nụ n’okpuru ike nile nke ka ịdị elu, Ndị-Rom 13:1. Kpee ekpere n’ihi ndị eze na ndị nile nọ n’ọnọdụ di elu, 1 Tim. 2:1–2. Na-anọdụ n’okpuru ala ọkpara-eze nile na ike nile ma na-erubere ndị-ikpe nile, Taịtọs 3:1. Dobe nụ onwe unu n’okpuru omenala ọbụla mmadụ dobere n’ihi Onye-nwe, 1 Pita 2:13–14. Jisus Kraịst ga-abụ ọchịchị ebighi-ebi nke ụwa, Mkpu. 11:15. Unu ga-enwe ndị ezi-omume ịbụ eze unu, Mosa. 23:8. Unu ga-eme ihe nile unu na-eme site n’olu ndị ahụ, Mosa. 29:26. Kraịst ga-abụ onye na-achị anyị mgbe ọ bịara, OznỌd. 41:4. Onye ahụ na-edebe iwu nke Chineke e nweghị ihe ga-eme ka ọ daa iwu nke obodo, OznỌd. 58:21. Mgbe ndị ajọọ mmadụ na-achị ndị mmadụ na-eru uju, OznỌd. 98:9–10. Ọchịchị nile ka Chineke hiwere n’ihi ọdị mma nke mmadụ, OznỌd. 134:1–5. Ndị mmadụ garịrị akwado ma bulie elu ọchịchị nile, OznỌd. 134:5. Anyị kwere na-ịnọ n’okpuru ndị-eze, ndị-isi nduzi, ndị ọchịchị, ndị ikpe, Ndep. Ok 1:12.