Nne Hụ kwa Ezi-na-ụlọ; Iv; Ndị Nne na Nna Akara dị nsọ na-atụnyere nwanyị onye na-amụ nwa ma-ọbụ na-edo ụmụ-ntakịrị ka ụmụ. Ndị nne na-enye aka n’atụmatụ Chineke site na-iweta arụ na-anwụ anwụ maka ụmụ nke Chineke na mụọ. Adam wee kpọ aha nwunye ya Iv, n’ihi na nwanyị ahụ bụ nne mmadụ nile nwere ndụ, Jen. 3:20 (Moses 4:26). Sọpụrụ nna gị na nne gị, Ọpụ. 20:12 (Ndị-Efe. 6:1–3; Mosa. 13:20). A hapụkwala iwu nne gị, Ilu 1:8. Mmadụ nzuzu na-eleda nne ya anya, Ilu 15:20 (Ilu 10:1). Eledakwala nne gị anya mgbe O mere agadi, Ilu 23:22. Ụmụ ya na di ya ebiliwo, kpọ ya onye a gọziri agọzi ma di ya na-aja ya mma, Ilu 31:28. Nne Jisus guzooro obe ya nso, Jọn 19:25–27. Puku ndị agha Leman abụọ abụrụwo ndị nne ha nile kuziworo ihe, Alma 56:47 (Alma 57:21). Nne anyị dị ebube Iv sooro n’etiti ndị ukwu na ndị dị ukwuu ndị Onye-nwe kuziiri n’ụwa ndị mụọ, OznỌd. 138:38–39.