Ụmụ ndịkom nke Hilaman Hụ kwa Hilaman, Nwa-nwoke nke Alma; Ndị Antai-Nifaị-Lihaị N’ime Akwụkwọ nke Mọmọn, ụmụ ndịkom nke ndị Leman a gbanwere a maara dika ndị Amọn ndị bịara bụrụ ndị dike n’agha n’okpuru ịchị agha Hilaman (Alma 53:16–22). Hilaman tụlere na ha kwesịrị ka a kpọ ha ụmụ ya ndịkom, Alma 56:10. Ndị nne ha akụziwororị ha ka ha ghara inwe obi abụọ na-idi ike Chineke ịnapụta ha, Alma 56:47. Ha meriri ndị Leman ma e chekwara ha n’ihi okwukwe ha nke na ọ dịghị otu onye n’ime ha e gburu, Alma 56:52–54, 56; 57:26.