N̄aa-ntị Hụ kwa Irube-isi, Nrube-isi, Rube-isi; Ntị Ịnụ na rube-isi nye olu-okwu ma-ọbụ nkụzi nile nke Onye-nwe. Onye-nwe ga-ekulite onye-amụma dịka ya onwe ya, ma unu ga an̄a ya nti, Deut. 18:15. Ịn̄a nti dị mma karịa abụba ebule nke ịchụ-aja, 1 Sam. 15:20–23. Anyị an̄aghị kwa ntị nye ndị-oru-gị, bụ ndị-amụma, Dan. 9:6. Ndị ezi-omume ndị na-an̄a ntị n’okwu nile nke ndị amụma, ha bụ ndị na-agaghị ala n’iyi, 2 Nif. 26:8. Ọbụrụ na unu a gaghị an̄a ntị n’olu nke onye-ọzụzụ-atụrụ ọma ahụ, unu abụghị atụrụ nke ya, Alma 5:38 (Hil. 7:18). N̄aa-ntị, O unu ndị Nzukọ-nsọ m, OznỌd. 1:1. Ndị ahụ na-an̄a-ntị n’olu nke Mụọ ahụ ka a na-enye ìhè ma na-abịakwute Nna ahụ, OznỌd. 84:46–47. Ha e meghị ngwa ịn̄a Onye-nwe ntị; ya mere, o meghị ngwa n’in̄a ntị na-ekpere ha nile, OznỌd. 101:7–9. Ndị ahụ na-an̄aghi iwu-nsọ nile ntị ka a na-ata ahụhụ, OznỌd. 103:4 (Moses 4:4).