Cherubim Ndị nile na-anochite anya ihe nile nke elu-igwe e kere eke, ụdị ha dị kpọmkwem bụ nke na-amataghị. Cherubim ka a kpọworo iche ebe nile dị nsọ nche. Onye-nwe wee mee ka Cherubim na-anọdụ idebe ụzọ nke osisi nke ndụ ahụ, Jen. 3:24 (Alma 12:21–29; 42:2–3; Moses 4:31). Akara nnọchite anya Cherubim ka e dobere n’elu Oche Ebere, Ọpụ. 25:18, 22 (1 Ndez. 6:23–28; Ndị-Hib. 9:5). A kpọtụrụ Cherubim ọnụ n’ọ̀hụ̀ nile nke Ezikiel, Ezik. 10; 11:22.