Nataniel
Otu Onye-ozi nke Kraịst na otu enyi nke Filip n’ime Testament Ọhụrụ (Jọn 1:45–51). O sitere na Kena nke Galili (Jọn 21:2). Kraịst kwuru na Nataniel bụụrụ onye Israel na-enweghị aghụghọ (Jọn 1:47). Ya na Batolomiu ka a na-eche n’ozuzu na ha bụ otu onye ahụ (Mat. 10:3; Mak 3:18; Luk 6:14; Jọn 1:43–45).