Ekele, Inye-ekele, Ju-n’ekele Hụ kwa Fee ofufe; Gọzie, Gọziri, Ngọzi Inwe afọ ojuju maka ngọzi nile a natara site n’aka Chineke. I gosi afọ-ojuju na-atọ Chineke ụtọ, ma ezi ofufe na-agụnye inye ya ekele. Anyị nile kwesịrị inye Onye-nwe ekele maka ihe nile. Ọ bụ ezi ihe ikele Onye-nwe ekele, Abụọma 92:1. Ka anyị were ekele bịa n’iru ya, Abụọma 95:1–2. Kelee nụ ya, gọzie kwa nụ aha ya, Abụọma 100:1–5. E wepụla aka n’ikele ekele, Ndị-Efe. 1:15–16. Bụrụ kwa nụ ndị na-ekele ekele, Ndị-Kọl. 3:15. Ngọzi, na otuto, na inye ekele, na inye nnukwu ugwu diri Chineke anyị, Mkpu. 7:12. O olee otu unu siri kwesị ikele Eze unu nke elu-igwe, Mosa. 2:19–21. Unu biri n’inye ekele kwa ụbọchị, Alma 34:38. Mgbe ị ga-ebili n’ụtụtụ ka obi gị jupụta n’ekele nye Chineke, Alma 37:37. Ka unu na-eme ihe nile n’ekpere na ị̀tụ mma mma, OznỌd. 46:7. Unu aghaghị inye Chineke ekele, OznỌd. 46:32. Na-eme nụ ihe ndị a jiri ịtụ mma-mma (inye ekele), OznỌd. 59:15–21. Nata ngọzi nke a site n’aka nke Onye-nwe n’obi juru n’ekele, OznỌd. 62:7. Onye na-anata ihe nile n’obi-ekele ka a ga-enye otuto, OznỌd. 78:19. N’ihe ọbụla nye ekele, OznỌd. 98:1 (1 Ndị-Tes. 5:18). Jaa Onye-nwe mma jiri ekpere nke ịja mma na inye-ekele, OznỌd. 136:28.