Ọdịmma Hụ kwa Ibu-ọnụ, Obubu-ọnụ; Ije-ozị; Inye ndị ogbenye onyinye, Onyinye ana enye ogbenye; Ogbenye; Onyinye Usoro nke na ụzọ maka ilekọta mkpa nile nke mụọ na nke arụ ndị mmadụ. I ghaghị isaghere nwanne gị aka gị, saghekwara ogbenye nke gị, na onye nke gị nọ na mkpa n’ala nke gị, Deut. 15:11. Onye na-enye ogbenye ihe, ihe adịghị akọ ya, Ilu 28:27. Ọ bụghị nke a bụ obubu-ọnụ nke m họọworo? Inye onye agụụ na-agụ nri gị, i webata onye ogbenye n’ime ụlọ gị, Aịsa. 58:6–7. Agụụ na-agu m unu wee nye m ihe m ga-eri; a bụ m ọbịa unu kpọbatara m; mgbe unu na-eme ya nye otu onye n’ime ụmụ nna m ndịa bụ ndị dikarịsịrị nta, mụ ka unu meworo ya nye, Mat. 25:35–40. Were ihe unu nwere lekọta onye ahụ chọrọ enyem-aka, Mosa. 4:16–26. Ha nyerịtara otu onye nye ibe ya, n’arụ ma na mụọ dika mkpa ha nile na ọchịchọ ha nile siri dị, Mosa. 18:29. E nyere ha iwu ka ha sonye n’ibu ọnụ na ekpere maka ọdịmma nke ndị na-amaghị Chineke, Alma 6:6. Na-ekpe nụ ekpere maka ọdịmma unu na maka ọdịmma nke ndị gbara unu gburu gburu, Alma 34:27–28. Ha nwekọtara ihe nile ọnụ n’etiti ha, 4 Nif. 1:3. Cheta nụ ndị ogbenye, OznỌd. 42:30–31. Unu leta ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa, OznỌd. 44:6. Cheta n’ime ihe nile ndị ogbenye na ndị nọ na mkpa, OznỌd. 52:40. Ahụhụ na-adịrị unu ndị ọgaranya, ndị na-agaghị enye ihe-onwunwe ha maka ndị ogbenye, na ahụhụ na-adịrị unu ndị ogbenye, ndị na-enweghị afọ ojuju, ndị nwere anya ukwu na ndị na-agaghị arụ ọrụ, OznỌd. 56:16–17. Na Zaịọn e nweghị ogbenye n’etiti ha, Moses 7:18.