Ikike na ike ahụ nke Chineke na-enye mmadụ ime omume n’ime ihe nile maka nzọpụta nke mmadụ (OznỌd. 50:26–27 ). Ndịkom nile bu ndị otu nke Nzukọ-nsọ ndị ji ọkwa nchụ-aja ka a haziri baa n’ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nile na a na-enye ha ikike ime emume-nsọ nile na ụfọdụ ọrụ nchịkwa nile n’ime Nzukọ-nsọ.
Echiwo m unu echichi, Jọn 15:16 .
E wulitewo unu dịka ụlọ nke mụọ, ndị ọkwa nchụ-aja dị nsọ, 1 Pita 2:5 .
Unu onwe unu bụ ọgbọ a họpụtaworo, òtù ndị nchụ-aja bụ kwa eze, 1 Pita 2:9 (Ọpụ. 19:6 ).
A na-akpọ ndị mmadụ ndị-isi nchụ-aja n’ihi okwukwe ha karịrị akarị na ọrụ ọma ha nile, Alma 13:1–12 .
Enye m gị ike ka i na-eme baptism, 3 Nif. 11:21 .
Unu ga-enwe ike inye Mụọ Nsọ, Moro. 2:2 .
Aga m ekpughe nye unu ọkwa nchụ-aja ahụ, site n’aka nke Elaịja, OznỌd. 2:1 (A—JS 1:38 ).
Onye-nwe nyekwara Erọn na mkpụrụ afọ ya otu ọkwa nchụ-aja, OznỌd. 84:18 .
Ọkwa nchụ-aja nke a dị ukwuu karịa na-elekọta ozi-ọma ahụ, OznỌd. 84:19 .
O wepụrụ Moses site n’etiti ha, na kwa Ọkwa Nchụ-aja ahụ Dị Nsọ, OznỌd. 84:25 .
Ịn̄ụ-iyi na ọgbụgba-ndụ nke ọkwa nchụ-aja ka a kọwara nke ọma, OznỌd. 84:33–42 .
Ọkwa nchụ-aja ahụ nọgidere site n’agbụrụ nke ndị nna unu, OznỌd. 86:8 .
E nwere, n’ime Nzukọ-nsọ, ọkwa nchụ-aja abụọ, OznỌd. 107:1 .
Nke mbụ bụ Ọkwa Nchụ-aja Di Nsọ n’igbaso Usoro ahụ nke Ọkpara nke Chineke, OznỌd. 107:2–4 .
Ugwu nile nke ọkwa nchụ-aja ahụ jikọrọ ọnụ na-enweghị ókè ya na ike nile nke elu-igwe, OznỌd. 121:36 .
O nweghị ike ma-ọbụ ike n’aru ọrụ n’ime pụrụ ime ma-ọbụ e kwesịrị ikwado ewezuga n’ụzọ ezi omume nke ọkwa nchụ-aja, OznỌd. 121:41 .
Onye nwoke ọbụla bụ onye otu nke Nzukọ-nsọ kwesịrị ntụkwasi-obi tozuru oke ga-anata ọkwa nchụ-aja, OznỌd. IỌỤ—2 .