N’ime akwụkwọ nsọ nile anya ka a na-ejikarị eme ihe akara nke mmadụ inwe ike ịnata ìhè nke Chineke. Dịka akara ahụ, anya mmadụ na-egosi ọnọdụ nke mụọ na nghọta nke ihe nile nke Chineke.
Ahụhụ na-adịrị ndị maara ihe n’anya nke onwe ha, 2 Nif. 15:21 (Aịsa. 5:21 ).
Ha malitere ibu ọnụ na ikpe ekpere ka anya ndị ahụ wee meghee, Mosa. 27:22 .
Setan mere ka isi kpuo ha n’anya, 3 Nif. 2:2 .
Ọdịghị onye ga-enwe ike iwepụta Akwụkwọ nke Mọmọn ìhè ewezuga ma ọ ga-elekwasị anya nanị n’otuto Chineke, Mọm. 8:15 .
Site n’ike nke Mụọ emeghere anya anyị nile ma nghọta anyị ka a kpalitere, OznỌd. 76:12 .
Ìhè ahụ bụ site na ya onye na-enye anya nile unu ìhè, OznỌd. 88:11 .
Ọbụrụ n’anya unu elekwasị nanị otuto nke m, arụ unu nile ga-ejupụta n’ìhè, OznỌd. 88:67 .